15 E mesịa, Fero nụrụ banyere ihe a, o wee nwaa igbu Mozis;+ ma Mozis si n’ebe Fero nọ gbaa ọsọ+ ka o wee biri n’ala Midian;+ o wee nọdụ ọdụ n’akụkụ otu olulu mmiri.
27Otú ọ dị, Devid kwuru n’obi ya, sị: “Otu ụbọchị aka Sọl ga-ala m n’iyi. Ọ dịghị ihe kara m mma ma ọ bụghị ịgbaga+ n’ala ndị Filistia;+ ike ga-agwụkwa Sọl ịchọ m n’ókèala dum nke Izrel,+ m ga-agbapụkwa n’aka ya.”
23 Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ;+ n’ihi na n’ezie, ana m asị unu, Unu agaghị agazu+ obodo ndị dị n’Izrel ma ọlị ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.+