10 E nwere ọkụ nke na-asọ asọ ka mmiri, nke si n’ihu ya na-asọpụta.+ E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi,+ nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.+ Ụlọikpe+ ahụ malitere ikpe, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.
10 Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi+ ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.+
11 M wee hụ, nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara ocheeze ahụ na ihe ndị ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gburugburu, ha dịkwa iri puku kwuru iri puku,+ na puku kwuru puku,+