30 Josef nọ na-eme ọsọ ọsọ ugbu a, n’ihi na obi nwanne mewere ya,+ nke mere na ọ chọrọ ebe ọ ga-anọ kwaa ákwá, o wee banye n’ọnụ ụlọ dị n’ime wee bee ákwá n’ebe ahụ.+
15 Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị emere nwa ọ mụrụ ebere?+ Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu,+ ma mụ onwe m agaghị echefu gị.+
20 “Ọ̀ bụ na Ifrem abụghị nwa m hụrụ n’anya na nwa m na-apa apa?+ N’ihi na ruo n’ókè m kwuru okwu megide ya, ruo n’ókè ahụ ka m na-aghaghị icheta ya.+ Ọ bụ ya mere eriri afọ m ji eme mkpọtụ n’ihi ya.+ Aghaghị m inwere ya ọmịiko,”+ ka Jehova kwuru.
8 “Olee otú m ga-esi gbahapụ gị, Ifrem?+ Olee otú m ga-esi rara gị nye, Izrel?+ Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Adma?+ Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Zeboyim?+ Agbanwewo m obi m;+ n’otu mgbe ahụ, ọmịiko m ekporowo ọkụ.