9 Ka Jehova bụ́ Chineke gị bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye nwere mmasị+ n’ebe ị nọ site n’ime ka ị nọkwasị n’ocheeze Izrel;+ n’ihi na Jehova hụrụ Izrel n’anya ruo mgbe a na-akaghị aka,+ nke mere na ọ họpụtara gị ịbụ eze+ ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi+ ma na-eme ezi omume.”+
12 Haịram kwukwara, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye kere eluigwe na ala,+ bụrụ onye a gọziri agọzi,+ n’ihi na o nyewo Devid bụ́ eze nwa maara ihe, onye nwere ezi uche na nghọta,+ bụ́ onye ga-ewuru Jehova ụlọ, wuokwara onwe ya obí eze.+