12 lee! m ga-eme ihe i kwuru.+ Lee! M ga-enye gị obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe,+ nke mere na ọ dịtụbeghị onye dị ka gị dịworo ndụ tupu gị onwe gị, ọ dịghịkwa onye ga-ebili mgbe ị nwụsịrị nke ga-adị ka gị.+
12 m ga-enye gị amamihe na ihe ọmụma;+ m ga-enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ n’ókè ọ na-enweghị ndị eze bu gị ụzọ nwere ya+ nakwa n’ókè ọ na-enweghị onye ga-enwe ya mgbe ị nwụsịrị.”+
5 Ya mere, ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ,+ ka ọ na-arịọ Chineke,+ n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha;+ ọ ga-enye onye ahụ amamihe.+