6 Ònye nwere ike iwuru ya ụlọ?+ N’ihi na eluigwe nakwa eluigwe nke eluigwe apụghị ịba ya,+ ònye ka m bụ+ iwuru ya ụlọ ma ọ́ bụghị naanị iwu ebe a ga na-esure ihe nsure ọkụ n’ihu ya?+
6 “Naanị gị bụ Jehova;+ ọ bụ gị kere eluigwe,+ ọbụna eluigwe nke eluigwe, na ìgwè ndị mmụọ ozi* niile nọ n’ime ya,+ ụwa+ na ihe niile dị n’elu ya,+ oké osimiri+ na ihe niile dị n’ime ya;+ ị na-echebekwa ha niile ndụ; ìgwè ndị mmụọ ozi+ nke eluigwe na-akpọkwara gị isiala.
2 Amaara m otu onye ya na Kraịst dị n’otu, onye e bupụrụ+ otú ahụ wee buga ya n’eluigwe nke atọ, afọ iri na anọ gara aga—ma ọ̀ bụ n’anụ ahụ́, amaghị m, ma ọ̀ bụ na ọ bụghị n’anụ ahụ́, amaghị m; Chineke maara.