31 Esila otú ahụ meso Jehova bụ́ Chineke gị,+ n’ihi na ihe niile ha na-emere chi ha bụ ihe arụ n’anya Jehova, bụrụkwa ihe ọ kpọrọ asị, n’ihi na ọbụna ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom ka ha na-esure n’ọkụ mgbe niile nye chi ha.+
14 Ọbụna ndị isi nchụàjà+ niile na mmadụ niile mere omume ekwesịghị ntụkwasị obi nke ukwuu, dị ka ihe arụ+ niile nke mba ndị ọzọ si dị, ha wee merụọ ụlọ Jehova, nke o doro nsọ na Jeruselem.+
51 “‘Ma Sameria+ emerughị ọbụna ọkara mmehie i mere, ma ị nọ na-eme ihe arụ dị ukwuu karịa nke ha mere. I wee mee ka ụmụnne gị ndị nwaanyị yie ndị ezi omume n’ihi ihe arụ niile ị nọ na-eme.+