11 E mesịa, eze Asiria+ dọọrọ Izrel n’agha+ laa Asiria, meekwa ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ,+ nke dị n’akụkụ osimiri Gozan nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia,+
13 M ga-esetịkwa n’ahụ́ Jeruselem eriri e ji atụ̀ ihe,+ bụ́ nke e ji tụọ Sameria,+ nakwa ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ dị larịị, bụ́ nke e ji tụọ ụlọ Ehab;+ m ga-ehichakwa+ Jeruselem dị nnọọ ka mmadụ si ehicha ọkwá, hichaa ya ma kpuo ya ihu.+