5 kama ọ bụ ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ n’ebo unu niile ime ka aha ya dịrị na ya, ime ka o biri na ya, ka unu ga-achọ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-abịa.+
29 ka anya gị dịrị+ n’ebe ụlọ a dị abalị na ehihie, n’ebe i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị na ya,’+ ka i gee ntị n’ekpere ohu gị chere ihu n’ebe a na-ekpe.+
3 Jehova wee sị ya: “Anụwo m ekpere+ gị na arịrịọ ị rịọrọ ka e meere gị amara bụ́ nke ị rịọrọ n’ihu m. Emewo m ka ụlọ a i wuru dị nsọ+ site n’ime ka aha m dịrị na ya+ ruo mgbe a na-akaghị aka; anya m+ na obi m ga-adịkwa na ya mgbe niile.+