8Ịlaịsha gwara nwaanyị ahụ o mere ka nwa ya dị ndụ ọzọ,+ sị: “Bilie, gị na ezinụlọ gị, gaa biri dị ka ọbịa n’ebe ọ bụla ị pụrụ ibi dị ka ọbịa;+ n’ihi na Jehova ekwuwo na ụnwụ ga-ada,+ ọ bụghị naanị nke ahụ, ọ ga-adị n’ala a ruo afọ asaa.”+
5 O wee ruo na mgbe ọ nọ na-akọrọ eze otú o si mee ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ,+ lee, nwaanyị ahụ o mere ka nwa ya dị ndụ ọzọ nọ na-etiku eze maka ụlọ ya na ubi ya.+ Gehezaị sịrị ozugbo: “Onyenwe m eze,+ lee nwaanyị ahụ, leekwa nwa ya ahụ Ịlaịsha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”