13 Ndị na-ejere ya ozi wee bịa gwa ya, sị: “Nna m,+ a sị na ọ bụ oké ihe ka onye amụma ahụ gwara gị, ọ̀ bụ na ị gaghị eme ya? Ma ya fọdụzie na ọ sịrị gị, ‘Mikpuo onwe gị na mmiri wee dị ọcha’?”
2 O wee sị: “Ụmụnna m na ndị bụ́ nna m, nụrụnụ. Chineke nke ebube+ pụtara ìhè n’ihu nna nna anyị bụ́ Ebreham mgbe ọ nọ na Mesopotemia, tupu ya agaa biri na Heran.+
15 N’ihi na ọ bụ ezie na unu pụrụ inwe puku ndị nduzi iri+ n’ime Kraịst, n’ezie, unu enweghị ọtụtụ nna;+ n’ihi na n’ime Kraịst Jizọs, aghọwo m nna unu site n’ozi ọma.+