4 N’afọ nke asaa, Jehoyada+ ziri ozi, e wee kpọtara ya ndị isi nke otu narị otu narị ndị nche Keria+ na ndị isi ndị ọgba ọsọ+ n’ụlọ Jehova, ya na ha wee gbaa ndụ,+ o wee mee ka ha ṅụọ iyi+ n’ụlọ Jehova, e mesịa, o gosiri ha nwa eze.
15 Ma Jehoyada onye nchụàjà nyere ndị isi nke ìgwè otu narị otu narị, bụ́ ndị isi ndị agha, iwu,+ sị ha: “Kpọpụnụ ya n’ebe a unu gbara gburugburu, werekwanụ mma agha gbuo onye ọ bụla nke na-eso ya n’azụ!”+ N’ihi na onye nchụàjà sịrị: “Unu ekwela ka e gbuo ya n’ụlọ Jehova.”