6 N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.+ Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.+
18 Jehova emewo ka i kwuo taa na unu ga-abụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe ya pụrụ iche,+ dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa,+ nakwa na ị ga-edebe ihe niile o nyere n’iwu,