21 Devid wee sị Maịkal: “Ọ bụ n’ihu Jehova, bụ́ onye họọrọ m kama ịhọrọ nna gị na ezinụlọ ya wee mee ka m bụrụ onye ndú+ nke ndị Jehova bụ́ Izrel ka m nọ na-enwe obi ụtọ, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova.+
7 “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.