9 kama ị malitere ime ihe ọjọọ karịa ndị niile bu gị ụzọ, i wee gaa meere onwe gị chi ọzọ+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ+ iji kpasuo m iwe,+ ọ bụkwa m ka i wezụgara n’azụ gị;+
3 O wee wughachi ebe ndị dị elu Hezekaya nna ya bibiri,+ o wukwaara Bel ebe ịchụàjà ma mee ogwe osisi dị nsọ, dị nnọọ ka Ehab+ eze Izrel mere. O wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe+ isiala,+ na-efekwa ha ofufe.+