5 Ọ bụkwa ya busoro eze ụmụ Amọn agha,+ e mesịa, o meriri ha, ụmụ Amọn wee nye ya otu narị talent ọlaọcha na ọka wit+ dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ iri+ na ọka bali dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ iri,+ n’afọ ahụ. Ọ bụ ihe a ka ụmụ Amọn kwụrụ ya, ọ bụkwa ya ka ha kwụrụ n’afọ nke abụọ nakwa na nke atọ.+