25 Jeremaya+ wee malite ịbụrụ Josaya abụ iru uju;+ ndị ikom niile na-abụ abụ na ndị inyom+ niile na-abụ abụ wee jiri Josaya na-abụ abụ iru uju ruo taa; ha mekwara ka ọ bụrụ ihe a ga na-eme n’Izrel, lee, e dere ya n’akwụkwọ abụ iru uju.+
67 e wezụga ohu ha ndị ikom+ na ohu ha ndị inyom, ndị dị puku asaa, narị atọ na iri atọ na asaa;+ ha nwekwara ndị ikom+ na-abụ abụ na ndị inyom+ na-abụ abụ, ndị dị narị abụọ na iri anọ na ise.