17 “Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka a gaa n’ụlọ akụ̀ eze nke dị na Babịlọn chọpụta+ ma ọ̀ bụ eziokwu na eze Saịrọs nyere iwu+ ka e wughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ka eze zitekwara anyị ihe o kpebiri banyere ihe a.”
21 “Ọ bụ mụ onwe m, bụ́ Eze Atazaksis, nyere ndị niile na-echekwa akụ̀+ n’ofe Osimiri+ iwu,+ na ihe niile Ezra+ onye nchụàjà, onye bụ́ ọkà n’idepụta ihe dị n’iwu Chineke nke eluigwe, rịọrọ unu, meenụ ya n’egbughị oge,