Jenesis 4:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Mgbe nke ahụ gasịrị, Ken gwara Ebel nwanne ya, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” O wee ruo na ka ha nọ n’ọhịa, Ken wakporo Ebel nwanne ya wee gbuo ya.+ 2 Samuel 3:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Mgbe Abna lọghachitere na Hibrọn,+ Joab kpọpụrụ ya iche, ha wee banye n’ọnụ ụzọ ámá ka ọ gwa ya okwu na nzuzo.+ Otú ọ dị, ọ mara ya mma n’afọ n’ebe ahụ,+ o wee nwụọ n’ihi ọbara Asahel+ nwanne ya. 2 Samuel 20:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Joab wee jụọ Amesa, sị: “Ị̀ dịkwa mma, nwanne m?”+ Joab wee were aka nri jide Amesa n’ajị agba ka o wee susuo ya ọnụ.+ Ilu 26:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Onye kpọrọ mmadụ asị na-eji egbugbere ọnụ ya eme ka a ghara ịmata onye ọ bụ, ma ọ na-etinye aghụghọ n’ime obi ya.+
8 Mgbe nke ahụ gasịrị, Ken gwara Ebel nwanne ya, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” O wee ruo na ka ha nọ n’ọhịa, Ken wakporo Ebel nwanne ya wee gbuo ya.+
27 Mgbe Abna lọghachitere na Hibrọn,+ Joab kpọpụrụ ya iche, ha wee banye n’ọnụ ụzọ ámá ka ọ gwa ya okwu na nzuzo.+ Otú ọ dị, ọ mara ya mma n’afọ n’ebe ahụ,+ o wee nwụọ n’ihi ọbara Asahel+ nwanne ya.
9 Joab wee jụọ Amesa, sị: “Ị̀ dịkwa mma, nwanne m?”+ Joab wee were aka nri jide Amesa n’ajị agba ka o wee susuo ya ọnụ.+
24 Onye kpọrọ mmadụ asị na-eji egbugbere ọnụ ya eme ka a ghara ịmata onye ọ bụ, ma ọ na-etinye aghụghọ n’ime obi ya.+