8 Unu onwe unu, deenụ ihe ọ bụla dị mma n’anya unu maka ọdịmma ndị Juu n’aha eze,+ jirikwanụ mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara; n’ihi na ọ gaghị ekwe omume imebi ihe ọ bụla e dere n’aha eze ma jiri mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara.”+