14 Absalọm na ndị ikom niile nke Izrel wee sị: “Ndụmọdụ Hushaị onye Akaịt ka ndụmọdụ Ahitofel mma!”+ Jehova n’onwe ya enyewo iwu+ iji mebie ndụmọdụ+ Ahitofel, ọ bụ ezie na ọ dị mma,+ ka Jehova wee mee ka ọdachi+ dakwasị Absalọm.
10 Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+ meekwa ka ntị ha kpọchie akpọchie,+ nyachiekwa anya ha, ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe, ka obi ha gharakwa ịghọta ihe, ka ha wee ghara ichegharị, e wee gwọọ ha.”+
25 N’oge ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.+
8 dị nnọọ ka e dere, sị: “Chineke enyewo ha mmụọ nke oké ụra,+ nyekwa ha anya ka ha wee ghara ịhụ ụzọ, nyekwa ha ntị ka ha wee ghara ịnụ ihe, ruo taa.”+