Ndị Ikpe 18:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Ma ha sịrị ya: “Mechie ọnụ. Kpuchie aka n’ọnụ gị, soro anyị gaa ka ị ghọọrọ anyị nna+ na onye nchụàjà.+ Olee nke kaara gị mma, ịbụ onye nchụàjà nke ụlọ otu+ onye ka ọ̀ bụ ịbụ onye nchụàjà nke otu ebo na otu ezinụlọ n’Izrel?”+ Job 40:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 “Lee! O nwekwaghị ihe m bụ.+Gịnịkwanụ ka m ga-aza gị?Ekpuchiwo m ọnụ m aka.+ Ilu 30:32 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 32 Ọ bụrụ na i mewo omume nzuzu site n’ibuli onwe gị elu,+ ọ bụrụkwa na i tinyewo uche gị ime ya, kpuchie aka n’ọnụ.+
19 Ma ha sịrị ya: “Mechie ọnụ. Kpuchie aka n’ọnụ gị, soro anyị gaa ka ị ghọọrọ anyị nna+ na onye nchụàjà.+ Olee nke kaara gị mma, ịbụ onye nchụàjà nke ụlọ otu+ onye ka ọ̀ bụ ịbụ onye nchụàjà nke otu ebo na otu ezinụlọ n’Izrel?”+
32 Ọ bụrụ na i mewo omume nzuzu site n’ibuli onwe gị elu,+ ọ bụrụkwa na i tinyewo uche gị ime ya, kpuchie aka n’ọnụ.+