4 Absalọm na-asịkwa: “A sị nnọọ na a họpụtara m ịbụ onyeikpe n’ala a,+ ka onye ọ bụla nke nwere okwu ikpe ma ọ bụ ikpe ọ chọrọ ka e kpeere ya bịakwute m! Mgbe ahụ, m ga-eme ka o nweta ikpe ziri ezi.”+
11 Heman wee kọọrọ ha banyere ịdị ukwuu nke akụnụba+ ya nakwa otú ụmụ ya si dị ọtụtụ+ nakwa ihe niile eze ji mee ka ọ dị ukwuu nakwa otú o si bulie ya elu karịa ndị isi na ndị na-ejere eze ozi.+
16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu;+ ka uche unu ghara ịdị n’ihe ndị dị elu,+ kama ka ihe ndị dị ala na-eduzi unu.+ Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.+