Abụ Ọma 139:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ọbụna ọchịchịrị agaghị agbara gị oké ọchịchịrị,+Kama abalị ga na-enwu gbaa dị nnọọ ka ehihie;+Ọchịchịrị ga-abụkwa ìhè.+ Aịzaya 29:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agami nnọọ agami iji zonahụ Jehova atụmatụ ha,+ ndị meworo omume ha n’ebe gbara ọchịchịrị.+ Ha na-asịkwa: “Ònye na-ahụ anyị, ònyekwa maara ihe anyị na-eme?”+ Jeremaya 23:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 “Ka ọ̀ dị onye pụrụ izo n’ebe nzuzo, mụ onwe m ewee ghara ịhụ ya?”+ ka Jehova kwuru. “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ejupụtaghị eluigwe na ụwa?”+ ka Jehova kwuru. Emọs 9:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel, m ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ. M ga-ejiderịrị ha.+ Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri+ ka m ghara ịhụ ha, m ga-enye agwọ iwu ka ọ taa ha n’ebe ahụ. Ndị Hibru 4:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya,+ ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+
12 Ọbụna ọchịchịrị agaghị agbara gị oké ọchịchịrị,+Kama abalị ga na-enwu gbaa dị nnọọ ka ehihie;+Ọchịchịrị ga-abụkwa ìhè.+
15 Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agami nnọọ agami iji zonahụ Jehova atụmatụ ha,+ ndị meworo omume ha n’ebe gbara ọchịchịrị.+ Ha na-asịkwa: “Ònye na-ahụ anyị, ònyekwa maara ihe anyị na-eme?”+
24 “Ka ọ̀ dị onye pụrụ izo n’ebe nzuzo, mụ onwe m ewee ghara ịhụ ya?”+ ka Jehova kwuru. “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ejupụtaghị eluigwe na ụwa?”+ ka Jehova kwuru.
3 Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel, m ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ. M ga-ejiderịrị ha.+ Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri+ ka m ghara ịhụ ha, m ga-enye agwọ iwu ka ọ taa ha n’ebe ahụ.
13 Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya,+ ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+