5 Dị ka nnụnụ nke na-efegharị si echebe ụmụ ya, otú ahụ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe Jeruselem.+ Ọ ga-echebe ya, napụtakwa ya.+ Ọ ga-emere ya ebere, ọ ga-emekwa ka ọ lanahụ.”
4 Ruo mgbe mmadụ mere agadi, abụ m otu Onye ahụ;+ ruokwa mgbe mmadụ nwere isi awọ́, mụ onwe m ga na-ebu ya.+ Mụ onwe m ga-eme ihe,+ ka mụ onwe m wee na-eku ya, na-ebu ya, meekwara ya ụzọ mgbapụ.+
13 Ọ dịghị ọnwụnwa bịakwasịrị unu nke na-abụghị nke na-abịara ụmụ mmadụ.+ Ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi,+ ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi,+ kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ,+ ka unu wee nwee ike idi ya.