Diuterọnọmi 23:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 “Ọ bụrụ na i kwe Jehova+ bụ́ Chineke gị nkwa, egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya, ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+ Abụ Ọma 15:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 N’anya ya, onye ọ bụla nke na-abaghị n’ihe bụ onye a jụrụ ajụ,+Ma ndị na-atụ egwu Jehova ka ọ na-asọpụrụ.+Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya.+ Abụ Ọma 76:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Kwenụ Jehova bụ́ Chineke unu nkwa ma mezuo ya, unu niile ndị gbara ya gburugburu.+Jirinụ egwu weta onyinye.+ Ekliziastis 5:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya,+ n’ihi na ihe ndị nzuzu+ adịghị atọ ya ụtọ. Ihe i kwere ná nkwa, mezuo ya.+ Jona 2:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà.+M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+ Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”+ Matiu 5:33 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 33 “Ọzọ, unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Aṅụla iyi+ n’emezughị ya, kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’+
21 “Ọ bụrụ na i kwe Jehova+ bụ́ Chineke gị nkwa, egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya, ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+
4 N’anya ya, onye ọ bụla nke na-abaghị n’ihe bụ onye a jụrụ ajụ,+Ma ndị na-atụ egwu Jehova ka ọ na-asọpụrụ.+Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya.+
11 Kwenụ Jehova bụ́ Chineke unu nkwa ma mezuo ya, unu niile ndị gbara ya gburugburu.+Jirinụ egwu weta onyinye.+
4 Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya,+ n’ihi na ihe ndị nzuzu+ adịghị atọ ya ụtọ. Ihe i kwere ná nkwa, mezuo ya.+
9 Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà.+M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+ Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”+
33 “Ọzọ, unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Aṅụla iyi+ n’emezughị ya, kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’+