28 Ha amawo abụba;+ ha na-egbu maramara. Ihe ọjọọ ha jubigakwara ókè. Ha adịghị ekpechite ọnụ onye ọ bụla,+ ọbụna ikpechite ọnụ nwa na-enweghị nna,+ ka ha wee nwee ihe ịga nke ọma;+ ha adịghịkwa ekpe ikpe ndị dara ogbenye.’”
6 ọ bụrụ na unu emegbughị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ,+ ọ bụrụ na unu awụfughị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a,+ ọ bụrụkwa na unu esoghị chi ọzọ dị iche iche iji kpatara onwe unu ọdachi,+
3 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume, napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya; unu emegbula onye mbịarambịa ọ bụla, nwa na-enweghị nna ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ.+ Unu emesola ha ihe ike.+ Unu awụfukwala ọbara ọ bụla na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a.+