15 “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe,+ unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ.+ Unu ga-ekpe mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.
12 Unu ụlọ Devid,+ nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi+ kwa ụtụtụ,+ napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya,+ ka ọnụma m ghara inwuru dị ka ọkụ+ wee ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya n’ihi omume ọjọọ unu.”’+
7 Ha elelịwo nna na nne nọ n’ime gị.+ Ha erigbuwo onye mbịarambịa nọ n’etiti gị.+ Ha emegbuwo nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ nọ n’ime gị.”’”+
29 Ndị ala ahụ akpawo nkata irigbu mmadụ,+ ha apụnarawo mmadụ ihe,+ megbuo onye nọ n’ahụhụ na ogbenye,+ ha erigbuwokwa onye mbịarambịa n’ekpeghị ya ikpe ziri ezi.’+
2 Agụụ inweta ubi agụwo ha, ha anarawokwa ha n’ike;+ agụụ inweta ụlọ agụwo ha, ha ewegharawokwa ha; ha erigbuwo nwoke na ezinụlọ ya,+ rigbuo nwoke ma weghara ihe nketa ya.+