29 Ndị ala ahụ akpawo nkata irigbu mmadụ,+ ha apụnarawo mmadụ ihe,+ megbuo onye nọ n’ahụhụ na ogbenye,+ ha erigbuwokwa onye mbịarambịa n’ekpeghị ya ikpe ziri ezi.’+
2 Agụụ inweta ubi agụwo ha, ha anarawokwa ha n’ike;+ agụụ inweta ụlọ agụwo ha, ha ewegharawokwa ha; ha erigbuwo nwoke na ezinụlọ ya,+ rigbuo nwoke ma weghara ihe nketa ya.+