4 Bienụ onwe unu úgwù maka Jehova, biekwanụ obi unu úgwù,+ unu ndị Juda na ndị bi na Jeruselem; ka ọnụma m ghara inwuru dị ka ọkụ, o wee ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya, n’ihi omume ọjọọ unu.”+
18 Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị oké iwe Jehova;+ ma ọkụ nke ekworo ya ga-eripịa ụwa dum,+ n’ihi na ọ ga-ekpochapụ ndị niile bi n’ụwa, mkpochapụ ahụ ga-adịkwa nnọọ ukwuu.”+