6 Jehova bụ́ Chineke gị ga-ebikwa obi+ gị na obi ụmụ gị úgwù,+ ka i wee jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya maka ndụ gị.+
26 bụ́ Ijipt+ na Juda+ na Idọm+ na ụmụ Amọn+ na Moab+ na ndị niile na-akpụ ntutu dị n’agba ntị abụọ ha, bụ́ ndị bi n’ala ịkpa;+ n’ihi na mba niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ụlọ Izrel dum bụkwa ndị a na-ebighị úgwù n’obi.”+
51 “Ndị na-ekwesi olu ike na ndị a na-ebighị úgwù n’obi+ na ná ntị, unu na-eguzogide mmụọ nsọ mgbe niile; dị ka nna nna unu hà mere, otú ahụ ka unu na-eme.+
29 Kama, ọ bụ onye bụ́ onye Juu n’obi bụ onye Juu,+ úgwù e biri ya bụkwa n’obi+ site na mmụọ, ọ bụghị site n’iwu e dere ede.+ Otuto+ onye ahụ na-abịa, ọ bụghị site n’aka mmadụ, kama site n’aka Chineke.+