20 Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee! m ga-awụkwasị iwe m na ọnụma m n’ebe a,+ wụkwasịkwa ya ụmụ mmadụ na anụ ụlọ na osisi dị n’ọhịa+ na ihe ala mepụtara; iwe m ga-enwurukwa ọkụ, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+
8 “‘N’ihi ya, cherenụ m,’+ ka Jehova kwuru, ‘ruo ụbọchị m ga-ebili ịkwakọrọ ihe,+ n’ihi na mkpebi m bụ ịchịkọta mba+ dị iche iche, ịchịkọta alaeze dị iche iche, iji wụkwasị ha ọnụma m,+ bụ́ oké iwe m niile; n’ihi na ọkụ nke ekworo m ga-eripịa ụwa dum.+