8 Unu atụla ụjọ, ya ejukwala unu anya.+ Ọ̀ bụ na mụ emeghị ka unu nụ ya n’otu n’otu, kọọkwara ya unu malite mgbe ahụ?+ Unu bụ ndị àmà m.+ Ọ̀ dị Chineke ọzọ dịnụ ma e wezụga m?+ Ee e, ọ dịghị Oké Nkume dịnụ.+ Ọ dịghị otu mụ onwe m ma.’”
14 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye na-aghọ aghụghọ bụ mgbe o nwere anụ nke ahụ́ dị mma, nke bụ́ oké n’ìgwè anụ ya, ma ya ana-ekwe nkwa, jiri nke ahụ́ na-adịghị mma na-achụrụ Jehova àjà.+ N’ihi na abụ m Eze ukwu,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “aha m ga-adịkwa egwu n’etiti mba niile.”+
6 n’ebe anyị nọ, otu Chineke dị,+ bụ́ Nna,+ onye ihe niile si n’aka ya dịrị, anyị onwe anyị dịkwaara ya;+ otu Onyenwe anyị dịkwa,+ bụ́ Jizọs Kraịst,+ onye e si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị,+ anyị onwe anyị sikwa n’aka ya.