9 Samuel wee were nwa atụrụ ka na-aṅụ ara chụọrọ Jehova àjà nsure ọkụ, bụ́ àjà a na-esurecha n’ọkụ;+ Samuel wee malite ịkpọku Jehova ka o nyere Izrel aka,+ Jehova wee za ya.+
18 Samuel wee kpọkuo Jehova,+ Jehova wee mee ka égbè eluigwe gbaa, meekwa ka mmiri zoo n’ụbọchị ahụ,+ ndị Izrel niile wee tụọ Jehova na Samuel egwu nke ukwuu.
32 Gịnị ọzọkwa ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere Gidiọn,+ Berak,+ Samsịn,+ Jefta,+ Devid+ na Samuel+ na ndị amụma ndị ọzọ,+