5 Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu.+ Kwụsị ịchọ ya.”’+
“‘N’ihi na, lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ niile,’+ ka Jehova kwuru, ‘ma m ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụụrụ gị ihe nkwata n’ebe niile ị ga-aga.’”+
14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma, abụghịkwa m nwa onye amụma;+ kama abụ m onye na-azụ anụ+ nakwa onye na-arụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ.
16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu;+ ka uche unu ghara ịdị n’ihe ndị dị elu,+ kama ka ihe ndị dị ala na-eduzi unu.+ Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.+