1 Ndị Eze 6:36 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 36 O wee jiri nkume a wapụtara awapụta dị ahịrị atọ+ na otu ahịrị ibé osisi sida wuo ogige ime ya.+ Abụ Ọma 84:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 N’ihi na otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.+Ahọrọwo m iguzo n’ọnụ ụzọ ụlọ Chineke m+Karịa ịgagharị n’ụlọikwuu ajọ omume.+ Abụ Ọma 92:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ndị a kụrụ n’ụlọ Jehova,+N’ogige ụlọ Chineke anyị,+ ga na-ama pokopoko. Abụ Ọma 96:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Nyenụ Jehova otuto kwesịrị aha ya;+Burunụ onyinye bata n’ogige ya.+ Abụ Ọma 116:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 N’ogige ụlọ Jehova,+N’ime gị, Jeruselem.+Toonụ Jaa!+
10 N’ihi na otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.+Ahọrọwo m iguzo n’ọnụ ụzọ ụlọ Chineke m+Karịa ịgagharị n’ụlọikwuu ajọ omume.+