10 Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+ Bụọnụ otuto ya n’abụ site na nsọtụ ụwa,+ unu ndị na-agbada n’oké osimiri+ na n’ihe jupụtara n’ime ya, unu agwaetiti na unu ndị bi na ha.+
9 Ha na-abụkwa abụ ọhụrụ,+ sị: “I kwesịrị ịnara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma meghee ihe ndị a kara akara e ji mechie ya, n’ihi na e gburu gị egbu, i jikwa ọbara gị+ zụtara+ Chineke ndị mmadụ+ si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile,