13 Anya gị dị nsọ nke ukwuu nke na ọ dịghị ele ihe ọjọọ; ị pụghịkwa ilegide nsogbu anya.+ Gịnị mere i ji na-ele ndị aghụghọ n’anya n’anya,+ na-agbachikwa nkịtị mgbe onye ajọ omume na-eloda onye na-eme ezi omume karịa ya?+
13 N’oge ọnwụnwa,+ ka onye ọ bụla ghara ịsị: “Ọ bụ Chineke na-anwa m.” N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.