Diuterọnọmi 32:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+ Abụ Ọma 5:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 N’ihi na ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ;+Onye ọjọọ agaghị ebinyere gị ma ọlị.+ Abụ Ọma 71:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Chineke, ezi omume gị dị ruo n’ebe dị elu;+A bịa n’oké ihe ndị i mere,+Chineke, ònye dị ka gị?+ Abụ Ọma 97:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu;+Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze ya.+ Abụ Ọma 145:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Jehova bụ onye ezi omume n’ụzọ ya niile,+Ọ na-eguzosikwa ike n’ọrụ ya niile.+ Ilu 16:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ime ajọ omume bụ ihe arụ n’anya ndị eze,+ n’ihi na ezi omume na-eme ka ocheeze guzosie ike.+ Mkpughe 15:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ha na-abụkwa abụ Mozis+ bụ́ ohu Chineke, na abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube,+ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,+ Eze mgbe ebighị ebi.+
4 Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+
2 Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu;+Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze ya.+
3 Ha na-abụkwa abụ Mozis+ bụ́ ohu Chineke, na abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube,+ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,+ Eze mgbe ebighị ebi.+