4 Chineke anyị, biko, nụrụ,+ n’ihi na anyị aghọwo ndị a na-elelị;+ mee ka ha jiri isi ha buru nkọcha+ ha, meekwa ka e meso ha dị ka ihe a kwatara n’agha, ka ha ghọọkwa ndị a dọọrọ n’agha laa n’ala ọzọ.
16 O wee ruo na, ngwa ngwa ndị iro anyị niile+ nụrụ ya, mba niile gbara anyị gburugburu ahụkwa ya, ihere onwe ha mere ha ozugbo, ha amarakwa na ọ bụ Chineke+ mere ka a rụọ ọrụ a.
11 Ma Jehova nọnyeere m+ dị ka dike dị egwu.+ Ọ bụ ya mere ndị na-akpagbu m ga-eji sụọ ngọngọ wee ghara imeri.+ Ihere ga-eme ha nke ukwuu, n’ihi na ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma. A gaghị echefu mmechuihu ha nke ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+