12 “Ma ọ bụrụ na unu anwaa anwaa laghachi azụ,+ unu ewee rapara n’ahụ́ ndị fọdụrụ ná mba ndị a,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu, unu na ha ewee na-agọ ọgọ,+ unu na ha ana-akpakọrịtakwa,
13 unu aghaghị ịmara na Jehova bụ́ Chineke unu agaghị anọgide na-anapụ mba ndị a ala ha n’ihi unu;+ ha ga-aghọkwara unu igbudu na ọnyà na ihe otiti n’akụkụ abụọ unu,+ ghọọkwa ogwu n’anya unu ruo mgbe unu lara n’iyi pụọ n’ezi ala a nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+