17 “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+
16 Ihere ga-eju gị afọ, ọ bụghị otuto.+ Gị onwe gị kwa ṅụọ ihe ọṅụṅụ,+ ka e werekwa gị dị ka onye a na-ebighị úgwù.+ Iko dị n’aka nri Jehova ga-abịara gị,+ ùgwù gị ga-akpụkwa n’ala;
19 Obodo ukwu ahụ+ wee kewaa ụzọ atọ, obodo dị iche iche nke mba niile wee daa; e chetakwara Babịlọn Ukwu ahụ+ n’ihu Chineke, ka e nye ya iko mmanya nke iwe nke ọnụma Ya.+
6 Mee ya dị ka ya onwe ya mere ndị ọzọ,+ meekwa ya okpukpu abụọ nke ihe o mere, ee, okpukpu abụọ nke ihe o mere ndị ọzọ;+ n’ime iko ahụ+ nke ọ gbanyere ihe ọṅụṅụ a gwara agwa, gbanyere ya okpukpu abụọ+ nke ihe ọṅụṅụ ahụ a gwara agwa.+