17 “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+
12 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee! Ọ bụ ezie na ịṅụ iko a amaghị ha ahụ́, ha aghaghị ịṅụ ya.+ À ga-ahapụ gị onwe gị kpamkpam n’enyeghị gị ntaramahụhụ? A gaghị ahapụ gị n’enyeghị gị ntaramahụhụ, n’ihi na ị ghaghị ịṅụ ya.”+
10 ọ ga-aṅụkwa mmanya nke iwe Chineke,+ bụ́ nke a na-agbanye n’ime iko nke ọnụma ya n’agwaghị ya agwa, a ga-ejikwa ọkụ na sọlfọ+ mekpaa ya ahụ́+ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.
19 Obodo ukwu ahụ+ wee kewaa ụzọ atọ, obodo dị iche iche nke mba niile wee daa; e chetakwara Babịlọn Ukwu ahụ+ n’ihu Chineke, ka e nye ya iko mmanya nke iwe nke ọnụma Ya.+
6 Mee ya dị ka ya onwe ya mere ndị ọzọ,+ meekwa ya okpukpu abụọ nke ihe o mere, ee, okpukpu abụọ nke ihe o mere ndị ọzọ;+ n’ime iko ahụ+ nke ọ gbanyere ihe ọṅụṅụ a gwara agwa, gbanyere ya okpukpu abụọ+ nke ihe ọṅụṅụ ahụ a gwara agwa.+