17 “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+
16 Ihere ga-eju gị afọ, ọ bụghị otuto.+ Gị onwe gị kwa ṅụọ ihe ọṅụṅụ,+ ka e werekwa gị dị ka onye a na-ebighị úgwù.+ Iko dị n’aka nri Jehova ga-abịara gị,+ ùgwù gị ga-akpụkwa n’ala;