17 “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+
26 na ndị eze niile nke ebe ugwu, ndị nọ nso na ndị nọ n’ebe dị anya, n’otu n’otu, na alaeze niile ọzọ nke ụwa bụ́ ndị dị n’elu ala; eze Shishak+ ga-aṅụkwa ya mgbe ha ṅụchara.
10 ọ ga-aṅụkwa mmanya nke iwe Chineke,+ bụ́ nke a na-agbanye n’ime iko nke ọnụma ya n’agwaghị ya agwa, a ga-ejikwa ọkụ na sọlfọ+ mekpaa ya ahụ́+ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.
19 Obodo ukwu ahụ+ wee kewaa ụzọ atọ, obodo dị iche iche nke mba niile wee daa; e chetakwara Babịlọn Ukwu ahụ+ n’ihu Chineke, ka e nye ya iko mmanya nke iwe nke ọnụma Ya.+