17 “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+
10 ọ ga-aṅụkwa mmanya nke iwe Chineke,+ bụ́ nke a na-agbanye n’ime iko nke ọnụma ya n’agwaghị ya agwa, a ga-ejikwa ọkụ na sọlfọ+ mekpaa ya ahụ́+ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.