41 Otú ọ dị, Isọ buuru Jekọb iwe n’obi n’ihi ngọzi ahụ nna ya gọziri ya,+ Isọ wee na-asị n’obi ya:+ “Oge a ga-eruru nna m uju na-eru nso.+ Ya gasịa, m ga-egbu Jekọb nwanne m.”+
31 N’ihi na ruo ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ n’elu ala, gị na ọbụbụeze gị agaghị eguzosi ike.+ N’ihi ya, zie ozi kpọtara m ya, n’ihi na ọ ga-anwụrịrị.”+
12 ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ wee gbuo+ nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ n’ihi na ọrụ ya jọrọ njọ,+ ma ọrụ nwanne ya ziri ezi.+