9N’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, ọnwa Eda,+ n’abalị iri na atọ ya, mgbe oge ruru ka e mezuo okwu eze na iwu ya,+ n’ụbọchị ndị iro ndị Juu nọ na-echere ka ha merie ha, ihe tụgharịrị, ndị Juu wee merie ndị kpọrọ ha asị.+
6 Ire bụ ọkụ.+ N’ime ihe niile dị anyị n’ahụ́, ire jupụtara n’ajọ omume, n’ihi na ọ na-eme ka ahụ́ dum nwee ntụpọ,+ ọ na-amụnyekwa usoro ndụ nke sitere n’okike ọkụ, Gehena* na-amụnyekwa ya ọkụ.