Abụ Ọma 21:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 N’ihi na ha emewo atụmatụ ime gị ihe ọjọọ;+Ha echepụtawo ihe ha na-apụghị imezu.+ Ilu 16:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Obi mmadụ nwere ike ichepụta ụzọ ya,+ ma ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ ya.+ Ilu 19:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Atụmatụ ndị dị n’obi mmadụ dị ọtụtụ,+ ma, ọ bụ nzube Jehova ga-eguzosi ike.+ Ilu 20:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Ijeụkwụ dimkpa si n’ebe Jehova nọ.+ Olee otú mmadụ ga-esi mata ụzọ nke ya?+ 1 Ndị Kọrịnt 7:37 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 37 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’obi ya, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ya mkpa, kama o nwere ike ịchịkwa ọchịchọ ya, ya ekpebiekwa n’ime obi ya na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ ga-eme nke ọma.+
37 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’obi ya, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ya mkpa, kama o nwere ike ịchịkwa ọchịchọ ya, ya ekpebiekwa n’ime obi ya na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ ga-eme nke ọma.+