20 E wee nyere ha aka ibuso ha agha, nke mere na e nyefere ndị Hega na ndị niile ha na ha so n’aka ha, n’ihi na ha kpọkuru Chineke maka enyemaka+ n’agha ahụ, o wee nabata arịrịọ ha n’ihi na ha tụkwasịrị ya obi.+
10 N’ihi na ọ bụ ya mere anyị ji na-arụsi ọrụ ike, na-adọgbukwa onwe anyị n’ọrụ,+ n’ihi na anyị nwere olileanya+ n’ebe Chineke dị ndụ nọ, onye bụ́ Onye Nzọpụta+ nke ụdị mmadụ niile,+ karịsịa nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi.+